Ebube

Album cover art for "Ebube" by Flavour

Flavour - Pop

Ebube

2 Plays

View Artist

Lyrics

Language:

A na-egbu ikuku mma? Onye maa aka, ikuku eburu ya A na-abala agụ mba? Agụ bata, mgbada agbara ọsọ Ọ na-eme, ka ọ daa eme? Onye sị na ife a na-eme enwerọọ isi Nwanne, e bulu isi ya tinye, o nwee isi O kwete na ọ na-eme Ị jụ na ị ma mba, a kpụbanye gị na line, ị banye Ị jụ na ị ma nghe, e tinyelụ gị akanwụ, you must ghee Nwanne, you must ghee by force oh, ka i kwete na ọ na-eme (Yahayahayaha) Ebube ndị nsọ Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Ebube ndị nsọ Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Gbadatanụ na oge erugo Ebubе m oo, ebube ndị nsọ ji aba Ka ndị jụlụ ajụ wee kwetе Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba O nwelụ onye mala aka, anyị emee gị ka ụmụaka Ị na-esi ọnwụ, anyị agbanyelụ gị, i kwete Mmanwụ na Ijele, adaa agbakọ n'ọgbọ There is only one power, nwanne m And that power is Jesus Christ Ike, ike, ike mmụọ nsọ gbadatanụ o Ike ka ike, ike mmụọ nsọ gbadatanụ eeyi Ike anyị ji aba mba Ike anyị ji eme ọnụ Ike anyị ji akpa ego Ike anyị ji eme ife Kedụ ife ị na-enwelụ anyị anyaụfụ? Ife Chukwu kwulunụ ka anyị ga-eme (Yahayahayaha) Ebube ndị nsọ Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Ebube, gbadata Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Gbadata meenụ ife i ji bụlụ chi Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Maka na ị kwadolụ anyị ọfụma Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba A na-egbu ikuku mma? Onye maa aka, ikuku eburu ya A na-abala agụ mba? Agụ bata, mgbada agbara ọsọ Ọ na-eme, ka ọ daa eme? Onye sị na ife a na-eme enwerọọ isi Nwanne, e bulu isi ya tinye, o nwee isi O kwete na ọ na-eme (Yahayahayaha) Ebube mmụọ nsọ Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Ebube mmụọ nsọ Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Gbadata meenụ ife i ji bụlụ chi Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba Ka ndị jụlụ ajụ wee kwete Ebube m oo, ebube ndị nsọ ji aba (Ka fa kwete na ọ na-eme) Ebube gbadata (Masta) Ebube gbadata (Ebube) Na o lue ka o si elu Ka fa malụ na anyị nwelụ Chukwu Chi anyị ji akpa ike Chi anyị ji aba mba Chi anyị ji eme ọnụ Ezege nnwa, ife Chukwu kwulunụ, ka anyị na-eme (Fino) Ugegbe nnwa, ife Chukwu kwulunụ, ka anyị na-eme Techy, onye ịgba, ife Chukwu kwulunụ, ka anyị na-eme Odumeje, nwata siri ike zie jaajaa (Jajajaja) Ọyọlịma

Rate this song

Rate this song

0/5.0 - 0 Ratings

5
0.0% (0)
4
0.0% (0)
3
0.0% (0)
2
0.0% (0)
1
0.0% (0)

Loading comments...

Credits

Writers
  • Flavour